2 Ndị eze 1:1 Moab we nupu isi megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri. 1:2 Ehazaia we da site n'ihe-idọba-oriọna n'ime-ulo-elu-ya nke di nime Sameria we ria ọria: o we ziga ndi-ozi, si ha, Jenu; jua Bealzebub, bú chi Ekron, ma m'gāb͕aputa n'ihe a ọrịa. 1:3 Ma mọ-ozi nke Jehova siri Elaija, bú onye Tisbe, Bilie, rigo zute ndi-ozi eze Sameria, si ha, Ọ̀ bughi ya n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, ka unu we je iju Bealzebub ajuju chi Ekron? 1:4 Ma ub͕u a otú a ka Jehova siri, I gaghi-esi na nke ahu ridata ihe-ndina nke i rigoro n'elu ya, ma i ghaghi inwu. Na Ịlaịja pụọ. 1:5 Ma mb͕e ndi-ozi ahu laghachikutere ya, ọ si ha, Gini mere ub͕u a unu chighariworo n'azu? 1:6 Ha we si ya, Otù nwoke we rigo izute ayi, si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zitere unu, si ya, Otú a ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ọ bughi n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel? Gi onwe-gi nēziga iju Bealzebub, bú chi Ekron, ase? ya mere gi onwe gi i gaghi-esi n'ihe-ndina ahu nke i rigoro n'elu rida, kama i gēsi n'ezie ịnwụ. 1:7 O we si ha, Òle madu bu onye rigoro izute? gi, gwa kwa gi okwu ndia? 1:8 Ha we za ya, si, Ọ bu nwoke aji, nēke kwa ihe-ọkiké akpụkpọ anụ banyere n'úkwù ya. Ọ si, Ọ bu Elaija onye Tisbe. 1:9 Eze we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ya onwe ya rigoro ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we kwue si ya, Gi onye nke Chineke, eze asiwo, Ridata. 1:10 Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ahu, Ọ buru na mu onwem bu onye Chineke, ka ọku si kwa n'elu-igwe ridata, ripia gi na gi iri ise. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na nke ya iri ise. 1:11 Ọzọ kwa, o zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Na ọ zara, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siri, Gbadata ọsọ ọsọ. 1:12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na mu onwem bu onye nke Chineke, ka ọku Si n'elu-igwe ridata, me ka gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi gwusia. Na ọkụ nke Chineke si n'elu-igwe ridata, me ka ọ gwusia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. 1:13 O we ziga kwa onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri-ya. Na nke Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia, da n'ikperè-ya abua Elaija we riọ ya, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum na ndu ndi-orù-gi abua na iri ndia di oké ọnu-ahia nime ya anya gi. 1:14 Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, rechapu ndi-ọchi-agha abua ahu nke ọgu ndi-agha abua na iri gara aga na ọgu ndi-agha abua na iri-ha: ma ka ndum di ub͕u a dị oké ọnụ ahịa n'anya gị. 1:15 Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: anọla egwu ya. O we bilie soro ya ridakuru eze. 1:16 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri: N'ihi na i zitere ndi-ozi ka ha jua Bealzebọb, bú chi Ekron, ọ bughi n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? ya mere i ga-eme ya esila n'ihe-ndina ahu nke i rigoro n'elu ya rida, kama i ghaghi igha anwụ. 1:17 O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we buru eze n'ọnọdu ya n'arọ nke-abua nke Jehoram nwa nke Jehoshafat, bú eze Juda; n'ihi na o nweghi nwa-nwoke. 1:18 Ma okwu Ehazaia nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?