2 Ihe E Mere
12:1 O rue, mb͕e Rehoboam mere ka ala-eze guzosie ike, we me ya
we me onwe-ya ka ọ di ike, ọ rapuru iwu Jehova, na Israel nile
ya na ya.
12:2 O rue, n'arọ nke-ise nke eze Rehoboam Shaishak
eze Ijipt rigoro imegide Jerusalem, n'ihi na ha emehiewo
megide Jehova,
12:3 chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri-na-abua;
ndikom ndi soro ya si n'Ijipt bia enweghi ọnu-ọgugu; ndị Lubim,
ndi Sukkiim, na ndi Etiopia.
12:4 O were obodo nile ewusiri ike nke Juda, biarue
Jerusalem.
12:5 Shemaia, bú onye-amuma, we biakute Rehoboam, biakute kwa ndi-isi Juda.
ndi achikọtara na Jerusalem n'ihi Shaishak, si
si ha, Otú a ka Jehova siri, Unu arapuwom, n'ihi nka ka unu gārapu
M'we rapu gi n'aka Shishak.
12:6 Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n'ala; na
ha siri, Onye ezi omume ka Jehova bu.
12:7 Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova
biakute Shemaia, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; ya mere m ga-eme
emela ka ha la n'iyì, ma M'gēme ka ha b͕apu ufọdu; na iwem
agaghi-atukwasi Jerusalem site n'aka Shaishak.
12:8 Otú ọ dị, ha ga-abụ ndị ohu ya; ka ha wee mara ọrụ m,
na ozi nke ala-eze nile nke mba nile.
12:9 Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, were ulo-ikwū ahu
àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze
ụlọ; ihe nile ka ọ chiri: ọta ọla-edo nile ka o we chiri
Solomon mere.
12:10 Eze, bú Rehoboam, mere ọta ọla n'ọnọdu ha, tukwasi ha
n'aka ndi-isi ndi-ob͕ū, bú ndi nēche ọnu-uzọ Jehova
ulo eze.
12:11 Ma mb͕e eze batara n'ulo Jehova, ndi-nche we bia
chiri ha, bughachi ha n'ime-ulo ndi-nche.
12:12 Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia
o kweghi ibibi ya: ọzọ kwa, ezi ihe di na Juda.
12:13 Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike nime Jerusalem, we buru eze: n'ihi na
Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze;
arọ iri na asa ka ọ bu eze na Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputaworo
site n'ebo nile nke Israel, itiye aha-ya n'ebe ahu. Na nne ya
aha-ya bu Neama, bú nwayi Amon.
12:14 O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.
12:15 Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ
akwukwọ nke Shemaia, bú onye-amuma, na nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ bayere
usoro ọmụmụ? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam
mgbe niile.
12:16 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo
Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.