2 Ihe E Mere
11:1 Ma mb͕e Rehoboam biaruru Jerusalem, o we chikọta ufọdu nime ulo
Juda na Benjamin, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù ise, ndi arọputara
bu ndi-dike, ibuso Israel agha, ka o we weta ala-eze ahu
ọzọ nye Rehoboam.
11:2 Ma okwu Jehova ruru Shemaia, bú onye nke Chineke, nti, si,
11:3 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile okwu
na Juda na Benjamin, si,
11:4 Otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-arigo, unu agaghi-ebuso kwa unu agha
umu-nna-ayi: laghachi, onye ọ bula n'ulo-ya: n'ihi na ihe a ka m'meworo.
Ha we ge nti okwu Jehova, si n'ibuso agha laghachi
Jeroboam.
11:5 Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ewusiri ike na Juda.
11:6 O wuru ọbuná Betlehem, na Itam, na Tekoa;
11:7 na Bet-zua, na Shoko, na Adulam;
11:8 na Gat, na Marisha, na Zif;
11:9 na Adoraim, na Lekish, na Azeka;
11:10 na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin
obodo ndị gbara ogige.
11:11 O we me ka ebe ewusiri ike guzosie ike, tiye ndi-ọchi-agha nime ha, nāchikọta kwa ihe
nke ihe-oriri, na nke manu na manya-vine.
11:12 Na n'obodo ọ bụla o tinyekwara ọta na ube, na-eme ha
ọ dị ike nke ukwuu, Juda na Benjamin nọkwa n'akụkụ ya.
11:13 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we biakute ya
site n'ókè-ala-ha nile.
11:14 N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-ha na ala-ha, bia
Juda na Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom achupuworo ha
nējere Jehova ozi:
11:15 O we chiri ya ndi-nchu-àjà nye ebe di elu, na ndi-mọ ọjọ, na
maka umu-ehi nke o mere.
11:16 Site kwa n'ebo nile nke Israel ndi nēdozi obi-ha n'azu ha
ichọ Jehova, bú Chineke Israel, biaruru Jerusalem, ichuru Jehova àjà
Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
11:17 Ha we me ka ala-eze Juda di ike, me kwa Rehoboam nwa nwa
Solomon di ike, arọ atọ: arọ atọ ka ha nēje ije n'uzọ di iche iche
Devid na Solomon.
11:18 Rehoboam we lutara onwe-ya Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid
na nwunye, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi;
11:19 Nke muru Ya umu; Jeush, na Shamaria, na Zaham.
11:20 Ma mb͕e ọ nwusiri ọ lutara Meaka nwa-nwayi Absalom; nke mụrụ ya
Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
11:21 Rehoboam we hu Meaka nwa-nwayi Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile
na iko-ya ndinyom: (n'ihi na ọ lutara ndinyom iri na asatọ na ọgu ndinyom atọ
iko-nwanyị; ọ mua umu-ndikom iri abua na asatọ, na ọgu umu-ndinyom atọ.)
ỌNU-ỌGUGU 11:22 Rehoboam we me Abaija nwa Meaka onye-isi, ka ọ buru onye-isi n'etiti ha.
umu-nne-ya: n'ihi na o chère ime ya eze.
11:23 O we were mara ihe, we b͕asa ufọdu nime umu-ya nile n'ebe nile
ala nile nke Juda na Benjamin, nye obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ya
ha na-eri nri n'ụba. Ọ chọkwara ọtutu ndinyom.