1 Samuel 27:1 Devid we si n'obi-ya, Ub͕u a ka m'gāla n'iyì otù ubọchi site n'aka nke-uku Sọl: Ọ dighi ihe dim nma kari na m'we b͕apu ọsọsọ ba n'ala ndi Filistia; Sọl gātu kwa obi n'arum ichọ ọzọ, n'ókè-ala Israel ọ bula: m'gāb͕apu kwa n'aka-ya. 27:2 Devid we bilie, gabiga, ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ ya na ya jekuru Ekish nwa Maok, bú eze Gat. 27:3 Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na nke ya ulo, ọbuná Devid na ndinyom-ya abua, bú Ahinoam, bú nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwayi Kamel, bú nwunye Nebal. 27:4 Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo na Gat: ma ọ chọghi ọzọ ọzọ maka ya. 27:5 Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi ha nyem ọnọdu n'otù obodo n'obodo, ka m'we biri n'ihi na n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi? 27:6 Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: ya mere Ziklag nwere ndi-eze Juda rue ta. 27:7 Ma ubọchi Devid biri n'ala ndi Filistia we di afọ zuru ezu na ọnwa anọ. 27:8 Devid na ndikom-ya we rigo, wakporo ndi Geshua, na ndi-ya ndi Gezrait, na ndi Amalek: n'ihi na mba ahu ka ọ bu site na mb͕e ochie ndi bi n'ala ahu, ka i nēje Shua, rue ala nke Egypt. 27:9 Devid we tib͕ue ala ahu, ma ọ rapughi nwoke ma-ọbu nwayi ndu, were wezuga aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na ndi uwe, laghachi, biakute Ekish. 27:10 Ekish we si, Òle ebe unu meworo uzọ ta? Devid we si, imegide Negeb nke Juda, megide kwa Negeb nke ndi Jerahmeel; ọ bu kwa imegide Ndida nke ndi-Kenait. 27:11 Devid we me ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, izisa ozi ọma na Gat. si, Ka ha we ghara igosi ayi, si, Otú a ka Devid mere, otú a ka ewe gēme kwa buru ya omume ubọchi nile ọ nēbi n'ala Jehova Ndị Filistia. 27:12 Ekish we kwere Devid, si, O mewo ndi-Ya Israel ịkpọ ya asị nke ukwuu; ya mere ọ gābu orùm rue mb͕e ebighi-ebi.