1 Ndị eze 4:1 Eze, bú Solomon, we buru eze Israel nile. 4:2 Ma ndia bu ndi-isi o nwere; Azaraia nwa Zedok ụkọchukwu, 4:3 Elihoref na Ahaia, umu-ndikom Shisha, bú ndi-ode-akwukwọ; Jehoshafat nwa-nwoke Ahilud, onye na-edekọ ihe. 4:4 Ma Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi usu-ndi-agha: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà: 4:5 Ma Azaraia nwa Netan bu onye-isi ndi-ọchi-agha: Zebud nwa-ndikom nke Netan bu onye-isi, na eyì eze: 4:6 Ma Ahisha bu onye-isi ulo: ma Adoniram nwa Abda bu n'elu ụtụ. 4:7 Solomon nwe-kwa-ra ndi-ndú iri na abua na-achị Israel nile, ndi nēdozi ihe-oriri bayere eze na ulo-ya: emere onye ọ bula ọnwa-ya n'arọ ndokwa. 4:8 Ma ndia bu aha-ha: nwa-nwoke Hua, n'ugwu Efraim. 4:9 Umu-ndikom Deka, nime Makaz, na nime Shaalbim, na nime Bet-shemesh; Elonbethanan: 4:10 nwa Hesed, nime Arubot; ya nwe Soko, na ala ahu nile nke Hepher: 4:11 Nwa Abinadab, n'akuku nile nke Doa; nke nwere Tafat ada Solomon lụrụ nwunye: 4:12 Beana nwa Ahilud; ya nwe Teanak na Megido, na ihe nile Bet-shean, nke di n'akuku Zartana n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ebe di n'ofè Jọkneam; 4:13 nwa Geba, nime Remot-gilead; obodo nile nke Jaia nwere nwa Manase, nke nọ na Gilead; ya metụtakwara ya akuku Agọb, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ nke nwere mb͕idi na mmanya brasen: 4:14 Ahinadab nwa Ido nwere Mahanaim. 4:15 Ahimaaz nọ na Naftali; ọ lụ-kwa-ra Basmat nwa-nwayi Solomon nwunye: 4:16 Beana nwa Hushai nọ n'Asha na n'Alot. 4:17 Jehoshafat nwa Parua, nime Isaka. 4:18 Shimai nwa Ila, nke Benjamin. 4:19 Geba nwa Uri nọ n'ala Gilead, n'ala di iche iche Saihon, bú eze ndi-Amorait, na nke Ọg, bú eze Beshan; ọ bu kwa ya naanị onye-isi nke nọ n’ala ahụ. 4:20 Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n'akụkụ oké osimiri ìgwè mmadụ, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu. 4:21 Solomon we buru eze ala-eze nile site n'osimiri rue ala nke ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēbute onyinye-inata-iru-ọma; o we fè Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya. 4:22 Ihe-oriri Solomon nke otù ubọchi bu orú mb͕é utu ọka flour na iri; na ọgu ọtùtù iri atọ; 4:23 Ehi iri mara abuba, na orú ehi sitere n'ebe-ita-nri, na ọgu aturu ise; nāgughi ele, na mb͕ada, na ele, na anu-ufe mara abuba. 4:24 N'ihi na o nwere ike n'ebe niile n'ógbè dị n'akụkụ osimiri, si Tifsa we rue Aza, bú onye-isi ndi-eze nile nke di n'ofè osimiri: ma ya onwe-ya udo diri ya buruburu. 4:25 Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine-ya na n'okpuru Osisi fig-ya, site na Dan we rue Bia-sheba, ubọchi nile nke Solomon. 4:26 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya ibu ub͕ọ-ala-ya; ndị-inyinya puku iri na abụọ. ỌNU-ỌGUGU 4:27 Ndi ahu nēje ozi we zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ihe nile bia na table eze, bú Solomon, nwoke ọ bula n'ọnwa-ya: ọ fọduru ha ọ dịghị ihe. 4:28 Ọzọ kwa, ọka bali na okporo-ọka nke inyinya na ìgwè ehi ka ha wetara ebe ndi-nchu-àjà nọ, nwoke ọ bula dika ihe-ndebe-ya si di. 4:29 Chineke we nye Solomon amam-ihe na nghọta ri nne, na nnukwu obi, ọbụna dị ka ájá nke dị n'ụsọ oké osimiri. 4:30 Amam-ihe Solomon we kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile obodo, na amam-ihe nile nke Ijipt. 4:31 N'ihi na ọ mara ihe kari madu nile; kari Itan, bú onye Ezra, na Himan, na Kalkol na Darda, umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile gburugburu. 4:32 O we tua nnù ilu atọ: Abù-ya di kwa nnù ilu abua na ọgu iri ise. 4:33 O we kwue okwu bayere osisi, site n'osisi cedar nke di na Lebanon we rue hyssop nke nēsi na mb͕idi puta: o kwu-kwa-ra okwu bayere anu-ọhia, na nke anu-ufe, na nke ihe nākpu akpu, na nke azù. 4:34 Ma e nwere ndị mmadụ niile bịara ịnụ amamihe Solomon, site na mmadụ niile ndi-eze nke uwa, ndi nuru amam-ihe-Ya.